11Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.”
12Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.”
13Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii.
14Ma ọ bụ nʼụbọchị izuike ka Jisọs gwakọtara aja, jiri ya meghe anya ya.
15Ya mere, ndị Farisii jụrụ ya otu o si bido ịhụ ụzọ. Ọ sịrị ha, “Ọ gwakọtara aja tee m nʼanya, a sakwara m ihu ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.”