9Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ya.” Ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụghị ya. Ọ bụ onye yiri ya.” Ma ọ na-asị, “Abụ m nwoke ahụ.”
10Ha na-asị ya, “Olee otu anya gị sịrị meghee?”
11Ọ zara, “Nwoke a na-akpọ Jisọs gwakọtara ụrọ tee m nʼanya. Ọ gwara m sị, ‘Gaa saa ihu gị nʼọdọ mmiri Sailọm.’ A gara m saa onwe m, malitekwa ịhụ ụzọ.”
12Ha sịrị ya, “Olee ebe nwoke ahụ nọ?” Ọ sịrị, “Amaghị m.”
13Ha dutere nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ nʼihu ndị Farisii.