3Ugbu a, O, Onyenwe anyị napụ m ndụ m. Ọ ga-adị m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.”
4Ma Onyenwe anyị sịrị, “O ziri ezi na ị ga-esi otu a wee oke iwe dị ọkụ?”
5Mgbe ahụ, Jona si nʼebe ahụ pụọ jee nọdụ ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke obodo ahụ. O weere ahịhịa meere onwe ya ụlọ ndo, nọdụ nʼime ya, chere ka ọ hụ ihe gaje ime obodo ahụ.
6Ma Onyenwe anyị Chineke rọpụtara otu osisi nwere akwụkwọ sara mbara, nke tolitere nʼelu isi Jona, ka o ghọọrọ ya ndo ịnapụta ya nʼọnọdụ ahụ mgbakasị. Jona ṅụrịrị ọṅụ maka osisi ahụ.
7Ma nʼisi ụtụtụ echi ya, Chineke mere ka otu ikpuru pụta nke riri osisi ahụ site nʼogwe ya, si otu a mee ka ọ kpọnwụọ.