Joshua 10

Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu.

Joshua 10:13 (UKJV) And the sun stood still, and the moon stayed, until the people had avenged themselves upon their enemies. Is not this written in the book of Jasher? So the sun stood still in the midst of heaven, and hasted not to go down about a whole day.

11Mgbe ha si nʼihu Izrel gbapụ ọsọ nʼụzọ nrịda Bet-Horon na-aga Azeka, Onyenwe anyị sitere nʼelu na-atụdakwasị ha ọtụtụ mkpụrụ mmiri. Ọnụọgụgụ ndị mkpụrụ mmiri ndị a dagburu dị ukwuu karịa ndị ụmụ Izrel ji mma agha ha gbuo.

12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel lụgbuo ndị Amọrait. Joshua gwara Onyenwe anyị okwu nʼihu ndị Izrel niile sị, “Gị, anyanwụ, guzo nʼotu ebe na mbara eluigwe Gibiọn. Gị, ọnwa, guzokwa nʼotu ebe na mbara eluigwe na Ndagwurugwu Aijalon”

13Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu.

14O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha.

15Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.