13Anyanwụ guzoro, ọnwa guzokwa. Ha abụọ adaghị tutu ruo mgbe ndị agha mba ahụ gbuchasịrị ndị iro ha. Ihe banyere akụkọ agha a ka e dere nʼakwụkwọ Jasha. Ya mere, anyanwụ guzoro nʼotu ebe nʼetiti mbara eluigwe. Ọ nọkwa nʼotu ebe ihe dịka otu ụbọchị zuru ezu.
14O nweghị ụbọchị ọzọ dịka ụbọchị ahụ nʼoge niile gara aga. Ọ dịbekwaghị ụbọchị yiri ụbọchị ahụ ruo taa. Ọ bụ ụbọchị Onyenwe anyị mere ka anyanwụ na ọnwa kwụsị, nʼihi naanị ekpere otu nwoke. Nʼihi na Onyenwe anyị na-eburu Izrel agha.
15Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.
16Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda.
17Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda,