Joshua 10

Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda,

Joshua 10:17 (UKJV) And it was told Joshua, saying, The five kings are found hid in a cave at Makkedah.

15Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu dị na Gilgal.

16Ma nʼoge ahụ a na-alụ agha ahụ, ndị eze ise ahụ si nʼọgbọ agha gbapụ, zoo onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda.

17Mgbe ozi ruru Joshua ntị, na a chọtala eze ise ndị ahụ, ebe ha zoro onwe ha nʼime ọgba nkume dị na Makeda,

18Joshua nyere iwu sị, “Werenụ nkume buru ibu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Debekwanụ ndị nche nʼebe ahụ, ka ha chee ndị eze ahụ nche.

19Ma unu eguzola nʼebe ahụ nʼonwe unu, chụsonụ ndị iro unu, na-egbukwanụ ha site nʼazụ. Unu ekwela ka ha gbaba nʼobodo ha dị iche iche, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu enyefeela ha nʼaka unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.