Joshua 10

Ya mere, Joshua na ndị Izrel tigbuchara ha kpamkpam nʼụzọ dị egwu, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nʼime ha nwere ike gbaba nʼime obodo ha e wusiri ike.

Joshua 10:20 (UKJV) And it came to pass, when Joshua and the children of Israel had made an end of slaying them with a very great slaughter, till they were consumed, that the rest which remained of them entered into fenced cities.

18Joshua nyere iwu sị, “Werenụ nkume buru ibu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Debekwanụ ndị nche nʼebe ahụ, ka ha chee ndị eze ahụ nche.

19Ma unu eguzola nʼebe ahụ nʼonwe unu, chụsonụ ndị iro unu, na-egbukwanụ ha site nʼazụ. Unu ekwela ka ha gbaba nʼobodo ha dị iche iche, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu enyefeela ha nʼaka unu.”

20Ya mere, Joshua na ndị Izrel tigbuchara ha kpamkpam nʼụzọ dị egwu, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nʼime ha nwere ike gbaba nʼime obodo ha e wusiri ike.

21Ndị agha niile laghachikwuru Joshua nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Makeda nʼudo. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nwara anwa kwuo okwu megide ndị Izrel nʼala ahụ.

22Mgbe ahụ Joshua sịrị, “Megheenụ ọnụ ọgba nkume ahụ, wepụtanụ ndị eze ise ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.