40Ya mere, Joshua na ndị agha ya meriri obodo ahụ niile, na ala ahụ niile. O meriri eze niile nke obodo ugwu ahụ, na ndị bi na Negeb, na mgbada ala ugwu dị nʼọdịda anyanwụ, na mgbada ala ugwu ugwu ahụ. O gbuchara mmadụ niile bi nʼala ahụ, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya iwu.
41Joshua tigburu ha niile site na Kadesh Banea ruo Gaza, sitekwa na Goshen ruo Gibiọn.
42Eze ndị a niile, na ala ha niile, ka Joshua meriri nʼotu oge ibu agha, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-alụrụ Izrel agha.
43Emesịa, Joshua na ndị Izrel niile laghachiri nʼọmụma ụlọ ikwu ha dị na Gilgal.