Joshua 10

Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn.

Joshua 10:7 (UKJV) So Joshua ascended from Gilgal, he, and all the people of war with him, and all the mighty men of valour.

5Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ.

6Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.”

7Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn.

8Ma Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.”

9Joshua bịakwutere ha na mberede, nʼihi na ogologo abalị niile ka o si Gilgal gaa njem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.