3Ya mere, Adoni-Zedek, eze Jerusalem ziri ozi zigara eze ndị a: Homa, eze Hebrọn, Piram, eze Jamut, Jafia, eze Lakish, na Debịa, eze Eglọn, na-asị,
4“Bịanụ nyere m aka, ka anyị gaa tigbuo Gibiọn, nʼihi na ha na Joshua na ụmụ Izrel emeela udo.”
5Mgbe ahụ, eze ise ndị Amọrait ndị a, eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish na eze Eglọn chịkọtara ndị agha. Ha na ndị agha ha gara were ọnọdụ ha imegide Gibiọn, ha lụsokwara ha ọgụ.
6Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.”
7Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn.