Joshua 10

Ma Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.”

Joshua 10:8 (UKJV) And the LORD said unto Joshua, Fear them not: for I have delivered them into yours hand; there shall not a man of them stand before you.

6Ma ndị Gibiọn mere ngwangwa zigara Joshua ozi nʼụlọ ikwu dị na Gilgal sị ya, “Bịa nyere ndị ohu gị aka. Bịa ngwangwa zọpụta anyị, nʼihi na eze niile nke ndị Amọrait, ndị bi nʼugwu, abịala nʼebe a, ha na ndị agha ha ibuso anyị agha.”

7Joshua na ndị agha ya niile, tinyere ndị ahụ niile ibu agha were anya, hapụrụ Gilgal gawa ịzọpụta Gibiọn.

8Ma Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Atụla ha egwu! Nʼihi na ha bụ ndị e meriri emeri. Enyela m ha nʼaka unu ịla ha nʼiyi. Ọ dịkwaghị otu onye nʼetiti ha nwere ike iguzo nʼihu unu.”

9Joshua bịakwutere ha na mberede, nʼihi na ogologo abalị niile ka o si Gilgal gaa njem.

10Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tinyere ha nʼọnọdụ ọgbaaghara mgbe ha zutere ndị Izrel. Nke a mere ka ndị agha Izrel lụgbuo ha na Gibiọn. Nʼezie, ọnụọgụgụ ndị ha tigburu na Gibiọn dị nnọọ ukwuu. Ma ha chụkwara ndị fọdụrụ ọsọ chụruo ha Bet-Horon, na Azeka, na Makeda, na-egbu ha nʼụzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.