Joshua 11

Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi.

Joshua 11:19 (UKJV) There was not a city that made peace with the children of Israel, save the Hivites the inhabitants of Gibeon: all other they took in battle.

17Nʼihi nke a, ala ndị Izrel nwere gbasara nʼụzọ niile site nʼugwu Halak, nke dị nso na Sia, ruo Baal-Gad nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, na ndịda ugwu Hemon. Joshua jidere ma gbukwaa ndị eze ndị ala ahụ niile.

18O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha.

19Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi.

20Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼonwe ya, mere ka ndị eze ahụ nyịchie obi ha, ka ha lụso Izrel agha, ka o si otu a laa ha nʼiyi, kpochapụkwa ha niile, na-emereghị ha amara, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

21Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.