1Mgbe Jabin eze Hazọ nụrụ nke a, o ziri ozi zigara Jobab eze ndị Madọn, zigakwara ndị eze obodo Shịmrọn na Akshaf,
2na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ,
3zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa.
4Ndị eze a niile kwekọrịtara chịkọtaa ndị agha ha niile nʼotu. Ndị agha ha chịkọtara dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha ji ọtụtụ ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ agha.