Joshua 13

Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.”

Joshua 13:7 (UKJV) Now therefore divide this land for an inheritance unto the nine tribes, and the half tribe of Manasseh,

5na ala ndị Gebal niile; na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat.

6“Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu.

7Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.”

8Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha.

9Ala ha gbatịrị site nʼAroea nke dị na ndagwurugwu Anọn, na site nʼobodo dị nʼetiti ndagwurugwu ahụ, ruo nʼala dị larịị nke gbatịrị site na Medeba ruo Dibọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.