Joshua 14

Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’

Joshua 14:9 (UKJV) And Moses swore on that day, saying, Surely the land whereon your feet have trodden shall be yours inheritance, and your children's for ever, because you have wholly followed the LORD my God.

7Agbara m iri afọ anọ nʼoge ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ anyị ịga iledo ala ndị Kenan anya. Mgbe anyị lọghachiri, agwara m ya okwu, kọwaara ya ihe m chere nʼobi m bụ eziokwu.

8Ma ụmụnna anyị, ndị anyị na ha so gaa, menyere ụmụ Izrel egwu, mee ka obi ha daa mba ịchọ ịbanye nʼala ahụ e kwere anyị na nkwa. Ma ebe m nọgidere jiri obi m niile soro Onyenwe anyị Chineke m,

9Mosis ṅụrụ iyi sị m, ‘Ebe ọ bụ na i ji obi gị niile soro Onyenwe anyị Chineke m, ala ahụ i jegharịrị ije nʼelu ya ga-abụ ihe nketa nye gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.’

10“Ugbu a, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa, o meela ka m dị ndụ. Nke a bụ iri afọ anọ na ise kemgbe Onyenwe anyị gwara Mosis okwu ndị a, mgbe Izrel na-awagharị nʼọzara. Ma ugbu a, lee, agbaala m iri afọ asatọ na ise taa.

11M dị ike taa dịka m dị nʼụbọchị ahụ Mosis zipụrụ m. Dịka ike m dị mgbe ahụ, adịkwa m ike ugbu a, ịpụ buo agha ma batakwa

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.