Joshua 15

Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị.

Joshua 15:20 (UKJV) This is the inheritance of the tribe of the children of Judah according to their families.

18Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”

19Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.

20Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị.

21Obodo niile nke ndị ebo Juda dị na Negev, nʼakụkụ ndịda nʼoke ala Edọm bụ ndị a: Kabzeel, Eda, Jaguo,

22Kina, Dimona, Adada,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.