Joshua 15

gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.

Joshua 15:6 (UKJV) And the border went up to Bethhogla, and passed along by the north of Betharabah; and the border went up to the stone of Bohan the son of Reuben:

4site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.

5Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,

6gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.

7Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.

8Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.