Joshua 15

Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.

Joshua 15:7 (UKJV) And the border went up toward Debir from the valley of Achor, and so northward, looking toward Gilgal, that is before the going up to Adummim, which is on the south side of the river: and the border passed toward the waters of Enshemesh, and the activities out thereof were at Enrogel:

5Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,

6gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.

7Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.

8Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim.

9Site nʼelu ugwu ebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị ruo na mmiri ime ala Neftoa, pụta site nʼebe ahụ ruo obodo niile dị nso ugwu Efrọn. Site nʼEfrọn, oke ala ahụ gbadara ruo Baala (nke aha ya ọzọ bụ Kiriat Jearim).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.