3Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka;
4site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda.
5Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,
6gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba, rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.
7Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.