Joshua 18

Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa.

Joshua 18:15 (UKJV) And the south quarter was from the end of Kirjathjearim, and the border went out on the west, and went out to the well of waters of Nephtoah:

13Oke ala ahụ sitekwara nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ Luz (ebe a na-akpọkwa Betel), ruokwa Atarọt-Ada, nke dị nʼakụkụ ndịda ugwu dị na mgbada Bet-Horon.

14Site nʼugwu ahụ chere Bet-Horon ihu nʼakụkụ ndịda, oke ala ahụ gbadara ndịda gbasoro akụkụ ọdịda anyanwụ pụta na Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim, otu nʼime obodo ndị Juda. Nke a bụ oke ala ahụ nʼọdịda anyanwụ.

15Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa.

16O sitekwara nʼebe ahụ gbada ruo na ndịda ugwu ahụ nke chere ihu na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nʼakụkụ ugwu Ndagwurugwu nke Refaim. O sitekwara nʼebe ahụ gafee ruokwa nʼakụkụ ndịda ugwu obodo ndị Jebus, ruo En-Rogel.

17Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.