14Site nʼugwu ahụ chere Bet-Horon ihu nʼakụkụ ndịda, oke ala ahụ gbadara ndịda gbasoro akụkụ ọdịda anyanwụ pụta na Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim, otu nʼime obodo ndị Juda. Nke a bụ oke ala ahụ nʼọdịda anyanwụ.
15Oke ala ha na ndịda sitere na nsọtụ akụkụ Kiriat Jearim rute nʼisi iyi mmiri Neftoa.
16O sitekwara nʼebe ahụ gbada ruo na ndịda ugwu ahụ nke chere ihu na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nʼakụkụ ugwu Ndagwurugwu nke Refaim. O sitekwara nʼebe ahụ gafee ruokwa nʼakụkụ ndịda ugwu obodo ndị Jebus, ruo En-Rogel.
17Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben.
18O sitere nʼebe ahụ gafee nʼakụkụ ugwu Bet-Araba gbadata rute nʼAraba,