17Site nʼEn Rogel oke ala ahụ gbatịrị ruo En-Shemesh, gafee ruo Gelilọt, nke chere ihu na nrigo ugwu Adumim. O si nʼebe ahụ ruo na nkume Bohan, nwa Ruben.
18O sitere nʼebe ahụ gafee nʼakụkụ ugwu Bet-Araba gbadata rute nʼAraba,
19ọ gafere gbatịrị ruo nʼakụkụ Bet-Hogla na mgbago ugwu, pụta nʼakụkụ ugwu nke osimiri Nnu, nke bụ nʼakụkụ ndịda ọnụ mmiri osimiri Jọdan. Nke a bụ oke ala ha nʼakụkụ ndịda.
20Oke ala ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ bụ osimiri Jọdan. Ndị a bụ ihe nketa ụmụ Benjamin, dịka oke ala ya niile si dị gburugburu, dị ka ikwu ya niile si dị nʼakụkụ niile.
21Ndị a bụ obodo e kenyere ebo Benjamin, dịka ikwu ha si dị: Jeriko, Bet-Hogla, Emek Keziz,