Joshua 18

Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ.

Joshua 18:6 (UKJV) All of you shall therefore describe the land into seven parts, and bring the description here to me, that I may cast lots for you here before the LORD our God.

4Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.

5Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu.

6Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ.

7Ma ndị Livayị agaghị eketa ala ọbụla nʼetiti unu, nʼihi na ihe nketa ha bụ ọrụ nchụaja ha na-arụ nʼihu Onyenwe anyị. Ebo Gad, na Ruben, na ọkara ebo Manase agaghị enwetakwa oke ọzọ, nʼihi na ha anarala ihe nketa nke ha nʼofe Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe Mosis onyeozi Onyenwe anyị kwere ha na nkwa na ha ga-ebi.”

8Ya mere, mgbe ndị ikom nledo ahụ gawara ijegharị nʼala ahụ niile, Joshua gwara ha okwu sị, “Jeenụ jegharịa nʼala ahụ niile. Depụtakwanụ otu unu chere a ga-esi kee ya nʼakwụkwọ. Mgbe unu lọtara aga m anọ nʼebe a bụ Shaịlo jụta Onyenwe anyị ase site nʼife nza, chọpụta ala nke ebo ọbụla ga-eketa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.