Joshua 18

Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.

Joshua 18:4 (UKJV) Give out from among you three men for each tribe: and I will send them, and they shall rise, and go through the land, and describe it according to the inheritance of them; and they shall come again to me.

2ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa.

3Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?

4Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.

5Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu.

6Unu depụtachaa ụzọ asaa ndị a nʼakwụkwọ, werenụ ya bịakwute m ka m feere unu nza nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị ịchọpụta ebo ga-eketa akụkụ ọbụla nʼala ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.