Joshua 18

ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa.

Joshua 18:2 (UKJV) And there remained among the children of Israel seven tribes, which had not yet received their inheritance.

1Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel,

2ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa.

3Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?

4Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.