Joshua 18

Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?

Joshua 18:3 (UKJV) And Joshua said unto the children of Israel, How long are all of you slack to go to possess the land, which the LORD God of your fathers has given you?

1Ọgbakọ Izrel niile zukọtara na Shaịlo maa ụlọ nzute nʼebe ahụ. Nʼoge a, ala ahụ niile bịara nʼokpuru ọchịchị ndị Izrel,

2ma e nwekwara ebo Izrel asaa a na-ekenyebeghị ala nke ha dịka ihe nketa.

3Ya mere, Joshua jụrụ ụmụ Izrel ajụjụ sị ha, “Ruo ole mgbe ka unu ga-eche tupu unu ekpochapụ ndị niile bi nʼala a, inweta ala Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nyere unu?

4Họpụtanụ ndị ikom atọ site nʼebo ọbụla, ndị m ga-eziga ka ha gaa jegharịa nʼala niile ahụ, dee ya nʼakwụkwọ nkọwa otu ihe nketa ọbụla si dị, nʼakụkụ ya niile. Mgbe ahụ, ha ga-alọghachikwute m.

5Ha ga-eke ala ahụ fọdụrụ ụzọ asaa. Ma ebo Juda ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ndịda, ụmụ ụmụ Josef kwa ga-anọgide nʼala ha nʼakụkụ ugwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.