Joshua 21

kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza.

Joshua 21:10 (UKJV) Which the children of Aaron, being of the families of the Kohathites, who were of the children of Levi, had: for theirs was the first lot.

8Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.

9Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha

10kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza.

11E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.)

12Ma eburularị ụzọ nye Kaleb nwa Jefune obodo ukwu na obodo nta niile, na ala ubi niile dị nʼakụkụ ya ka ọ bụrụ ihe nketa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.