Joshua 22

“Echiche obi anyị bụ na ọ bụrụ na ụmụ ụmụ unu ekwuo ihe dị otu a, ụmụ anyị ga-azaghachi ha sị, ‘Lee ebe ịchụ aja nna anyị ha wuru, nke yiri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. E wughị ya maka ịchụ aja nsure ọkụ, kama e wuru ya dịka ihe ama na-egosi nnwekọ dị nʼetiti anyị na unu.’

Joshua 22:28 (UKJV) Therefore said we, that it shall be, when they should so say to us or to our generations in time to come, that we may say again, Behold the pattern of the altar of the LORD, which our fathers made, not for burnt offerings, nor for sacrifices; but it is a witness between us and you.

26“Ọ bụ nke a mere anyị ji kpebie sị, ‘Ka anyị jikere wuo ebe ịchụ aja, ma ọ bụghị ebe ịchụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ndị ọzọ,’

27Kama, ọ bụ ebe ịchụ aja ịhụba ama nʼetiti unu na anyị, nakwa ọgbọ ndị nke ga-esote anyị, na anyị ga-efe Onyenwe anyị ofufe nʼụlọnsọ ya, site na ịchụrụ ya aja nsure ọkụ, na aja udo. Mgbe ahụ, nʼoge dị nʼihu, ụmụ ụmụ unu agaghị asị ụmụ ụmụ anyị, ‘Unu enweghị oke nʼime Onyenwe anyị Chineke.’

28“Echiche obi anyị bụ na ọ bụrụ na ụmụ ụmụ unu ekwuo ihe dị otu a, ụmụ anyị ga-azaghachi ha sị, ‘Lee ebe ịchụ aja nna anyị ha wuru, nke yiri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. E wughị ya maka ịchụ aja nsure ọkụ, kama e wuru ya dịka ihe ama na-egosi nnwekọ dị nʼetiti anyị na unu.’

29“Anyị agaghị enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ; anyị agaghị esitekwa nʼiso Onyenwe anyị Chineke wezuga onwe anyị, site nʼiwuru onwe anyị ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka maọbụ ụdị aja ọzọ dị iche iche. Ebe ịchụ aja anyị maara bụ ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke anyị, nke guzo nʼihu ụlọ nzute ya.”

30Mgbe Finehaz onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ ahụ, bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Izrel nụrụ ihe ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ụmụ Manase kwuru, ọ masịrị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.