Joshua 23

Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya.

Joshua 23:11 (UKJV) Take good heed therefore unto yourselves, that all of you love the LORD your God.

9“Onyenwe anyị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu.

10Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa.

11Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya.

12“Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ,

13maranụ nke ọma, na Onyenwe anyị Chineke unu agaghị achụpụrụ unu mba ndị a site nʼala unu. Kama ha ga-abụrụ unu igbudu na ọnya. Ha ga-abụkwara unu apịpịa nʼakụkụ unu, na ogwu nʼanya unu, ruo mgbe unu ga-ala nʼiyi nʼezi ala a, nke Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.