8Kama raparanụ nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa.
9“Onyenwe anyị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu.
10Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa.
11Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya.
12“Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ,