Joshua 23

Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ.

Joshua 23:4 (UKJV) Behold, I have divided unto you by lot these nations that remain, to be an inheritance for your tribes, from Jordan, with all the nations that I have cut off, even unto the great sea westward.

2Ya mere, Joshua kpọrọ ndị Izrel niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ.

3Unu onwe unu ejirila anya unu hụ ihe niile Onyenwe anyị Chineke unu mere mba ndị a niile, nʼihi unu. Ọ lụụrụ unu ọgụ, nyere unu aka imeri ndị iro unu.

4Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ.

5Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu kwere unu nkwa.

6“Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.