Joshua 23

“Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla.

Joshua 23:6 (UKJV) Be all of you therefore very courageous to keep and to do all that is written in the book of the law of Moses, that all of you turn not aside from it to the right hand or to the left;

4Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ.

5Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu kwere unu nkwa.

6“Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla.

7Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha.

8Kama raparanụ nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.