Joshua 24

Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.”

Joshua 24:23 (UKJV) Now therefore put away, said he, the strange gods which are among you, and incline your heart unto the LORD God of Israel.

21Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama Onyenwe anyị ka anyị ga-efe ofufe.”

22Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.”

23Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.”

24Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”

25Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.