23Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.”
24Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”
25Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe.
26Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ Onyenwe anyị.
27Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.”