25Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe.
26Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ Onyenwe anyị.
27Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.”
28Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.
29Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri.