Joshua 24

Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.

Joshua 24:28 (UKJV) So Joshua let the people depart, every man unto his inheritance.

26Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ Onyenwe anyị.

27Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.”

28Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.

29Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri.

30E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera, nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.