Joshua 4

Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị,

Joshua 4:5 (UKJV) And Joshua said unto them, Pass over before the ark of the LORD your God into the midst of Jordan, and take you up every man of you a stone upon his shoulder, according unto the number of the tribes of the children of Israel:

3ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”

4Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla,

5Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị,

6ka ha bụrụ ihe ịrịbama nʼetiti unu. Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ isi ogidi nkume a dị nʼebe a?’

7Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.