Joshua 4

ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”

Joshua 4:3 (UKJV) And command all of you them, saying, Take you behind out of the midst of Jordan, out of the place where the priests' feet stood firm, twelve stones, and all of you shall carry them over with you, and leave them in the lodging place, where all of you shall lodge this night.

1Mgbe mba ahụ niile gafesịrị osimiri Jọdan, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,

2“Site nʼetiti ndị ụmụ Izrel họpụta ndị ikom iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla,

3ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”

4Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla,

5Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.