Joshua 5

Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.

Joshua 5:10 (UKJV) And the children of Israel encamped in Gilgal, and kept the passover on the fourteenth day of the month at even in the plains of Jericho.

8Mgbe e bizuru mba niile ahụ ugwu, ha nọdụrụ nʼebe ahụ ha mara ụlọ ikwu tutu ọnya obibi ugwu ha alaa.

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị, “Taa, ewezugala m site nʼebe unu nọ ihe nkọcha nke ya na Ijipt so.” Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Gilgal. Ọ bụkwa aha ya ruo taa.

10Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.

11Nʼụbọchị sotere ụbọchị ngabiga, nʼotu ụbọchị ahụ, ha riri ụfọdụ ihe ubi nke ala Kenan. Ọ bụ achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, na ọka ahụrụ nʼọkụ ka ha tara.

12Mánà kwụsịkwara nʼechi ya mgbe ha riri nri sitere nʼala ahụ. Ụmụ Izrel ahụkwaghị mánà anya ọzọ, ma nʼafọ ahụ ha riri ihe omume ubi si nʼala Kenan.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.