Joshua 5

Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.”

Joshua 5:2 (UKJV) At that time the LORD said unto Joshua, Make you sharp knives, and circumcise again the children of Israel the second time.

1Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na Onyenwe anyị emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel.

2Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.”

3Ya mere, Joshua ji nkume mee mma ntakịrị e ji bie ụmụ Izrel niile ugwu. Ebe a nọ bie ụmụ Izrel ugwu bụ ebe a na-akpọ Gibịat Haaralot.

4Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.