2Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya, “Jiri nkume mee mma ị ga-eji bie ụmụ Izrel niile ugwu ọzọ.”
3Ya mere, Joshua ji nkume mee mma ntakịrị e ji bie ụmụ Izrel niile ugwu. Ebe a nọ bie ụmụ Izrel ugwu bụ ebe a na-akpọ Gibịat Haaralot.
4Nke a bụ ihe mere o ji mee otu a: Ndị ikom niile si nʼIjipt pụta, ndị tozuru ije agha, nwụrụ nʼụzọ, nʼime ọzara, mgbe ha hapụchara Ijipt.
5Mgbe ụmụ Izrel niile si Ijipt pụta, e biri ndị nwoke niile nọ nʼetiti ha ugwu. Ma nʼime iri afọ anọ ahụ ha na-awagharị nʼọzara, o nweghị ụmụ ha ndị nwoke a mụrụ nʼoge a e biri ugwu.
6Ndị Izrel niile awagharịala nʼọzara iri afọ anọ tutu ruo mgbe ndị ikom niile toruru ije agha, bụ ndị hapụrụ Ijipt nwụchara, ebe ọ bụ na ha jụrụ irubere Onyenwe anyị isi. Nʼihi na Onyenwe anyị ṅụrụ iyi sị ha na ha agaghị ahụ ala ahụ anya, bụ ala ahụ o kwere nna nna ha na nkwa, inye anyị, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.