15Ma onye ọbụla e jidere ji ihe ndị ahụ e doro nsọ ka a ga-akpọ ọkụ, ya onwe ya, na ihe niile ọ nwere, nʼihi o mebiela iwu ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, meekwa ihe jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel.’ ”
16Nʼihi nke a, Joshua biliri nʼisi ụtụtụ. O mere ka ebo niile dị nʼIzrel bịaruo nso nʼebo nʼebo, ebo Juda ka a họọrọ.
17Mgbe ahụ, e mere ka ikwu niile dị nʼebo Juda bịaruo nso, ikwu Zera ka ahọpụtara. Mgbe e mere ka ikwu Zera pụta nʼezinaụlọ ha niile nʼotu nʼotu, ezinaụlọ Zimri bụ nke ahọpụtara.
18Joshua mere ka ndị ikom niile dị nʼezinaụlọ Zimri pụta nʼotu nʼotu, ma e jidere Ekan, nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera onye ebo Juda.
19Mgbe ahụ, Joshua sịrị Ekan, “Nwa m, nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel otuto, nyekwa ya nsọpụrụ. Gwa m ihe i mere. Ezonarịkwala m ihe ọjọọ i mere.”