17Mgbe ahụ, e mere ka ikwu niile dị nʼebo Juda bịaruo nso, ikwu Zera ka ahọpụtara. Mgbe e mere ka ikwu Zera pụta nʼezinaụlọ ha niile nʼotu nʼotu, ezinaụlọ Zimri bụ nke ahọpụtara.
18Joshua mere ka ndị ikom niile dị nʼezinaụlọ Zimri pụta nʼotu nʼotu, ma e jidere Ekan, nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera onye ebo Juda.
19Mgbe ahụ, Joshua sịrị Ekan, “Nwa m, nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel otuto, nyekwa ya nsọpụrụ. Gwa m ihe i mere. Ezonarịkwala m ihe ọjọọ i mere.”
20Mgbe ahụ, Ekan zara Joshua sị ya, “Ọ bụ eziokwu! Emehiela m megide Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Lee ihe m mere.
21Mgbe m hụrụ nʼetiti ihe ndị a kwatara nʼagha, otu uwe mwụda Babilọn mara mma, na narị Shekel ọlaọcha abụọ, na mkpirisi ọlaedo ịdị arọ ya ruru iri shekel ise. E nwere m anya ukwu nʼebe ihe ndị a dị, chịrị ha. Lee, ezoro m ha nʼime ala nʼụlọ ikwu m, ọlaọcha ahụ dịkwa nʼokpuru ya.”