Joshua 8

Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ.

Joshua 8:23 (UKJV) And the king of Ai they took alive, and brought him to Joshua.

21Nʼihi na mgbe Joshua na ndị agha Izrel so ya lepụrụ anya hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo Ai na-arịgo elu, ha matara na ndị ha zoro onwe ha nʼọhịa abanyela obodo Ai, lụgbuo ya. Ya mere, Joshua na ndị agha so ya tụgharịrị bido igbu ndị agha obodo Ai.

22Ndị agha Izrel ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha Ai ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Ai nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha Izrel abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha Izrel menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ.

23Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ.

24Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ.

25Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.