Joshua 8

Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu.

Joshua 8:25 (UKJV) And so it was, that all that fell that day, both of men and women, were twelve thousand, even all the men of Ai.

23Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ.

24Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ.

25Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu.

26Nʼihi na Joshua nọgidere setịpụ ùbe o ji nʼaka ya, megide obodo Ai, tutu e bibie ndị niile nọ nʼobodo ahụ kpamkpam.

27Ma ndị Izrel kwaara anụ ụlọ, na ihe nkwata nʼagha nke obodo ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Joshua nʼiwu si dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.