Joshua 8

Ya mere, Joshua kpọrọ obodo Ai ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa.

Joshua 8:28 (UKJV) And Joshua burnt Ai, and made it an heap for ever, even a desolation unto this day.

26Nʼihi na Joshua nọgidere setịpụ ùbe o ji nʼaka ya, megide obodo Ai, tutu e bibie ndị niile nọ nʼobodo ahụ kpamkpam.

27Ma ndị Izrel kwaara anụ ụlọ, na ihe nkwata nʼagha nke obodo ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Joshua nʼiwu si dị.

28Ya mere, Joshua kpọrọ obodo Ai ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa.

29Ma Joshua kwụbara eze ndị Ai nʼelu osisi site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Mgbe anyanwụ dara, Joshua nyere iwu ka e wedata ozu eze Ai site nʼosisi ahụ, tụsa ya nʼihu ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, ha tụkọtara ọtụtụ nkume nʼelu ya. Nkume ahụ ha tụkọtara dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.

30Mgbe ahụ, Joshua wuuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ebe ịchụ aja nʼelu ugwu Ebal,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.