Jud 1

Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.

Jude 1:10 (UKJV) But these speak evil of those things which they know not: but what they know naturally, as brute beasts, in those things they corrupt themselves.

8Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.

9Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”

10Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.

11Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora.

12Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.