Jud 1

Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora.

Jude 1:11 (UKJV) Woe unto them! for they have gone in the way of Cain, and ran greedily after the error of Balaam for reward, and perished in the gainsaying of Core.

9Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”

10Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.

11Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora.

12Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ.

13Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.