Ndị Ikpe 1

Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.

Judges 1:15 (UKJV) And she said unto him, Give me a blessing: for you have given me a south land; give me also springs of water. And Caleb gave her the upper springs and the nether springs.

13Otniel nwa Kenaz, nwanne nta Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.

14Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”

15Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.

16Ụmụnna nwunye Mosis, onye Ken, si nʼobodo nkwụ nkwụ soro ndị Juda, gaa biri nʼetiti ndị ahụ bi nʼọzara Juda, na Negev, nke dị nso nʼArad.

17Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.