11Site nʼebe ahụ, ha jekwuru ndị bi na Debịa (nke a na-akpọ Kiriat Sefa, nʼoge mbụ).
12Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
13Otniel nwa Kenaz, nwanne nta Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
14Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
15Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.